1. Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike,N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.
2. Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri:Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.
3. Onye ọ bula nke nāhu amam-ihe n'anya nēme ka nna-ya ṅuria:Ma onye bu eyì nke ndinyom nākwa iko nāla àkù-ya n'iyì.