Ilu 27:17-21 Bible Nso (IGBOB)

17. Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

19. Dika miri si eme ka iru hu iru,Otú a ka obi nēme ka madu hu madu.

20. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì;Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu.

21. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo,Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya.

Ilu 27