Ilu 27:12-18 Bible Nso (IGBOB)

12. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya:Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra.

13. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe;N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe.

14. Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya,Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya.

15. Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo,Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri:

16. Onye nēzobe ya ezobewo ifufe,Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute.

17. Ígwè nāmucha ígwè;Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya.

18. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya;Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.

Ilu 27