Ilu 26:6-13 Bible Nso (IGBOB)

6. Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miriKa onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.

7. Ogwe-ukwu abua nke onye-ngwurọ nākwu efe:Otú a ka ilu di n'ọnu ndi-nzuzu.

8. Dika akpa nkume di iche iche nke di oké ọnu-ahia n'obo nkume,Otú a ka onye nēnye onye-nzuzu nsọpuru di.

9. Dika ogwu nke dumiworo n'aka onye nāṅubiga manya ókè,Otú a ka ilu n'ọnu ndi-nzuzu di.

10. Onye-ọ̀kà nākpu ihe nile,Ma onye nēgo onye-nzuzu ilu ọlu di ka onye nēgo ndi nāgabiga agabiga.

11. Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ,Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.

12. Ì huwo onye ọ bula nke bu onye mara ihe n'anya-ya?Olile-anya diri onye-nzuzu kari onye ahu.

13. Onye-ume-ngwu asiwo, Ọdum di n'uzọ;Ọdum di n'amá.

Ilu 26