Ilu 25:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:

10. Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.

11. Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.

12. Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.

13. Dika oyi snow n'ubọchi owuwe-ihe-ubi,Otú a ka ukọ̀ nke kwesiri ntukwasi-obi diri ndi nēziga ya;Ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-nwe-ya ka ọ nēwelata.

14. Igwe-oji na ifufe nke miri-ozuzo nādighiKa onye nke nānya isi n'onyinye okwu-ugha bu.

15. Site n'eweghi iwe ọsọsọ ka anāràye onye-isi,Ire nrò nānyaji kwa ọkpukpu.

16. Ọ̀ bu manu-aṅu ka i chọtaworo? racha nke gēzuru gi;Ka i we ghara iriju ya afọ, we b͕ọ ya.

17. Me ka ukwu-gi kọ ukọ n'ulo madu-ibe-gi;Ka ihe-gi we ghara iju ya afọ, o we kpọ gi asì.

Ilu 25