Ilu 25:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi na ọ di nma ka asi gi, Rigota ebe a;Kari ka eme ka i di ala n'iru onye amara aha-ya,Onye anya-gi abua huworo.

8. Apula ngwa ngwa ise okwu,Ka o we ghara ibu na i maghi ihe i gēme n'ikpe-azu-ya,Mb͕e madu-ibe-gi etiyewo gi n'ọnọdu-ihere.

9. Gi na madu-ibe-gi kwurita okwu-ikpe-gi,Ekpughe-kwa-la izù nzuzo nke onye ọzọ:

10. Ka onye nke nānu ya we ghara ikwulu gi,Akukọ ihe ọjọ gi ewe ghara isi n'ebe i nọ laghachi.

11. Nkpuru-osisi apple ọla-edo nime nkata ọla-ọchaKa okwu ekwuru na mb͕e kwesiri ya bu.

12. Nb͕a-aka ọla-edo na ihe-ichọ-nma nke ọla-edo ọmaKa onye nāba nba nke mara ihe bu na nti nke nānu ihe.

Ilu 25