18. Otùtù-agha na mma-agha na àkú di nkọKa onye nke nāb͕a àmà okwu-ugha megide madu-ibe-ya bu.
19. Ezé nyajiri anyaji na ukwu chikwa-puru echikwapuKa itukwasi onye-nghọb͕u obi n'ubọchi ahuhu bu.
20. Dika onye nēyipu uwe n'ubọchi oyi, dika manya b͕ara uka n'elu akanwu,Otú a ka onye nābùru obi jọrọ njọ abù di.
21. Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asì, gi me ka o rie nri;Ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri:
22. N'ihi na icheku nēre ọku ka i nāgukwasi n'isi-ya,Jehova gākwughachi kwa gi.
23. Ifufe Ugwu nāmuputa oké miri-ozuzo:Ọ bu kwa iru oké iwe ka iré nēkwu okwu-azu nāmuputa.