Ilu 21:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. Uzọ ọ bula nke onye ọ bula ziri ezi n'anya-ya abua:Ma onye nātùzi obi nile ka Jehova bu.

3. Ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpeBu ihe Jehova nārọputa kari àjà.

4. Anya npako na obi di nganga,Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.

5. Èchìchè nile nke onye di nkọ nēdubà nání n'urù:Ma èchìchè nile nke onye ọ bula nke nēme ngwa nēdubà nání n'ikọ-ukọ.

6. Ikpa àkù site n'ire okwu-ughaBu otù nku-ume anēfesa n'ifufe; ndi nāchọ àkù ahu nāchọ ọnwu.

Ilu 21