12. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu;Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.
13. Onye nēkwuchipu nti-ya n'iti-nkpu nke onye nēnweghi ike,Ya onwe-ya gākpọ kwa nkpu, ma agaghi-aza ya.
14. Onyinye enyere na nzuzo nādaju iwe,Iri-ngo ezobere n'uwe-obi nādaju kwa ọnuma siri ike.
15. Ọ buru onye ezi omume ọṅù ime ihe ekpere n'ikpe;Ma nbibi diri ndi nālu ajọ ihe.
16. Madu nke nēsi n'uzọ ezi uche akpafu,Nime nkpọkọta nke ndi nādighi ndu ka o gēzu ike.
17. Onye ihe kọrọ ka onye nāhu ọṅù n'anya gābu:Onye nāhu manya-vine na manu n'anya agaghi-abu ọgaranya.
18. Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu;Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.
19. Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara,Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.
20. Àkù anāchọsi ike na manu di n'ebe-obibi nke onye mara ihe;Ma madu nzuzu nēloda ya.