Ilu 2:11-17 Bible Nso (IGBOB)

11. Ìzùzù ganēche gi nche,Nghọta gēchebe gi:

12. Inaputa gi n'uzọ onye ọjọ,N'aka madu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu;

13. Bú ndi nārapu okporo-uzọ nile nke izi-ezi,Ka ha we je ije n'uzọ nile nke ọchichiri;

14. Ndi nāṅuri ime ihe ọjọ,Ha nēteghari egwú ọṅù n'ib͕akuta Chineke azu nke onye ọjọ;

15. Ndi okporo-uzọ nile ha b͕agọrọ ab͕agọ,Ha nēsihie kwa n'uzọ nile ha:

16. Inaputa gi n'aka nwayi nābughi nwunye-gi,N'aka nwayi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ;

17. Nke nārapu di o nwere n'ab͕ọghọ,Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke-ya kwa, o chezọwo ya:

Ilu 2