5. Ihe-árú n'anya Jehova ka onye ọ bula bu nke obi-ya di elu:Site n'aka rue aka, agaghi-agu ya n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
6. Eji ebere na ezi-okwu ekpuchi ajọ omume:Ọ bu kwa egwu Jehova ka madu ji esi n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
7. Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ,Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.