23. Obi onye mara ihe nēme ka ọnu-ya nwe uche,Ọ nātukwasi-kwa-ra eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua nmuta.
24. Ub͕ub͕ọ-manu-aṅu ka okwu-ọnu utọ nile bu,Nke nātọ nkpuru-obi utọ, buru kwa ihe nāgwọ ọkpukpu n'ọria.
25. Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu,Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu.
26. Ọchichọ-nkpuru-obi nke onye nādọb͕u onwe-ya n'ọlu adọb͕uworo ya onwe-ya n'ọlu;N'ihi na ọnu-ya erugidewo ya.
27. Onye jọb͕uru onwe-ya nēgwuputa ihe ọjọ:Ọ bu kwa n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka ihe dika ọku nāru aru di.