1. Onye nāhu idọ-aka-na-nti n'anya nāhu ihe-ọmuma n'anya:Ma onye nākpọ iba-nba asì bu anu-ọhia.
2. Ezi madu gēnweputa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ:Ma onye nzube ọjọ ka Ọ gāma ikpe.
3. Madu agaghi-eguzosi ike site na nmebi-iwu:Ma nkpọrọgwu ndi ezi omume, agaghi-eropu ya.