19. Onye nēguzosi ike n'ezi omume gēru na ndu:Ma onye nāb͕aso ihe ọjọ gēru n'ọnwu nke aka ya.
20. Ihe-árú n'anya Jehova ka ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'obi bu:Ma ihe nātọ Ya utọ ka ndi zuru okè n'uzọ-ha bu.
21. Site n'aka rue aka, agaghi-agu onye ọjọ n'onye nēmeghi ihe ọjọ:Ma nkpuru ndi ezi omume gēwepuga onwe-ha.