Hosea 9:1-3 Bible Nso (IGBOB)

1. Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n'ihi na i puwo n'aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n'anya n'ebe-nzọcha-ọka nile.

2. Ebe-nzọcha-ọka na ebe-nzọcha-nkpuru-vine agaghi-azù ha, manya-vine ọhu gēbilata-kwa-ra ya.

3. Ha agaghi-ebi n'ala Jehova; ma Efraim gālaghachi n'Ijipt, ọ bu kwa n'Asiria ka ha gēri ihe ruru árú.

Hosea 9