Habakuk 3:3-5 Bible Nso (IGBOB)

3. Chineke si na Timan nābia,Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. SelahEbube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile,Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.

4. Onwunwu-Ya di ka ìhè;Ìhè nēnwuputa n'aka-Ya:Ọ bu kwa n'ebe ahu ka ebe-nzuzo nke ike-Ya di.

5. N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga,Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.

Habakuk 3