18. Ùrù gini ka arusi apiri api bara, na onye nēme ya apiwo ya? ùrù gini ka arusi awuru awu na onye-ozízí okwu-ugha bara, na onye nākpu ihe-ya akpuru akpu atukwasiwo ya obi, ime arusi dara ob͕i di iche iche?
19. Ahuhu diri onye nāsi osisi, Teta; nke nāsi nkume dara ob͕i, Kpọte onwe-gi! Nka, ò gēzí ihe? Le, ihe a bu ihe eji ọla-edo na ọla-ọcha machita, ọ dighi kwa mọ ọ bula di nime ya.
20. Ma Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ: dere du n'iru Ya, gi uwa nile.