7. Ndi anātu ujọ, ndi dikwa egwu, ka ha bu: n'aka ha onwe-ha ka ikpé-ha na nbuli-elu-ha si aputa.
8. Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.
9. Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá.
10. E, mba ahu nākwa ndi-eze emò, ndi-isi bu-kwa-ra ya ihe-ichì-ọchì: mba ahu nāchì ebe ọ bula ewusiri ike ọchì; n'ihi na o nēkpokọba ájá, we were ya.
11. Mb͕e ahu ọ gēfebiga dika ifufe, o we gabiga, ikpe ama ya: ike-ya nka ewe ghọ chi-ya.