Ezra 8:3-9 Bible Nso (IGBOB)

3. Site n'umu Shekania; site n'umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.

4. Site n'umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.

5. Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.

6. Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.

7. Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.

8. Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.

9. Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.

Ezra 8