3. Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.
4. Ha we me ememe ulo-ntu, dika edeworo ya, ha we chua àjà-nsure-ọku nke ubọchi n'ubọchi-ha n'ọnu-ọgugu, dika ikpé si di, bú ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya;
5. mb͕e ihe a gasiri ha we chua àjà-nsure-ọku nke mb͕e nile, na nke diri ọnwa ọhu, na nke diri mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú nke edoro nsọ, na nke diri onye ọ bula nke nēwere afọ-ofufo nye Jehova onyinye-afọ-ofufo.
6. Site n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa ka ha malitere isurere Jehova àjà-nsure-ọku: ma akātọghi ntọ-ala ulo uku Jehova.