15. Otú ọ di, Jonatan nwa Asahel na Jahzeia nwa Tikva guzoro imegide ihe a: Meshulam na Shabetai, bú onye Livai, yekwara ha aka.
16. Umu nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ we me otú a. Ewe kewapu Ezra, bú onye-nchu-àjà, na ndikom ọzọ, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ha nile n'aha-ha kwa; ha we nọdu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-iri ka ha we jua ajuju okwu a.
17. Ha we jubìe ajuju n'okwu ndikom nile ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu.