15. O we sim, Le, enyewom i ǹsí ehi n'ọnọdu ǹsí madu, i gēme kwa achicha-gi n'elu ya.
16. O we sim, Nwa nke madu, le, M'gaje ib͕aji nkpa-n'aka, bú achicha, nime Jerusalem: ha ewe rie achicha n'ọtùtù na nime ncheb͕u; ha gāṅu kwa miri n'ọtùtù na n'anya ọ nēju ha:
17. ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.