6. Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi.
7. Buru onye jikere, e, jikere onwe-gi, gi onwe-gi, na nkpọkọta ndi-gi nile, ndi akpọkọtaworo n'ebe i nọ, gi buru ha ọchi-agha.
8. Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.
9. I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.
10. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na ihe di iche iche gābata n'obi-gi, i gēchè kwa èchìchè ọjọ:
11. i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere: