Ezikiel 18:3-6 Bible Nso (IGBOB)

3. Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel.

4. Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.

5. Ma onye ọ bula, mb͕e ọ bu onye ezi omume, nke nēme ihe ekpere n'ikpe na ezi omume,

6. asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;

Ezikiel 18