Ezikiel 1:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.

2. N'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, nke ahu bu arọ nke-ise nke emere ka Jehoiakim je biri n'ala ọzọ,

3. okwu Jehova ruru Ezikiel nwa Buzi, bú onye-nchu-àjà, nti n'ezie n'ala ndi Kaldea, n'akuku osimiri Keba; aka Jehova we di ya n'aru n'ebe ahu.

4. M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu.

5. Ọzọ, n'etiti ya ka oyiyi nke ihe anọ di ndu si puta. Ma nka bu ka ha si di n'ile ha anya; oyiyi madu ka ha nwere.

Ezikiel 1