Esta 9:20-25 Bible Nso (IGBOB)

20. Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,

21. ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,

22. dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.

23. Ndi-Ju we nara ihe ahu nke ha malitere ime, na nke Mọdekai degara ha n'akwukwọ;

24. n'ihi na Heman nwa Hamedata, onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju nile, chère èchìchè megide ndi-Ju ime ka ha la n'iyì, o we fe Pua, nke ahu bu nzà, ichusa ha, na ime ka ha la n'iyì;

25. ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.

Esta 9