8. O rue, mb͕e anuru okwu eze na iwu-ya, mb͕e achikọbata-kwa-ra ọtutu umu-ab͕ọghọ nime Shushan, bú ulo uku eze, rue aka Hegai, na ekubatara Esta n'ulo eze, rue aka Hegai, onye nēdebe ndinyom.
9. Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom.
10. Esta egosighi ndi-ya ma-ọbu umu-nna-ya: n'ihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara igosi ha.
11. Mọdekai we nējeghari n'iru ogige ulo ndinyom n'ubọchi nile ọ bula, imara udo Esta, na ihe agēme ya.
12. Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n'ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)
13. nwa-ab͕ọghọ ahu we biakute eze n'uzọ di otú a, anēnye ya ihe ọ bula ọ nāsi ha nye, iso ya si n'ulo ndinyom biarue ulo eze.
14. N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha.
15. Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.