Esta 1:16-18 Bible Nso (IGBOB)

16. Memukan we kwue n'iru eze na ndi-isi, si, Ọ bughi eze, nání ya, ka Vashti, bú nwunye eze, mere ajọ omume megide, kama megide ndi-isi nile, megide kwa ndi di iche iche nile ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs.

17. N'ihi na okwu a bayere nwunye eze gāpu rue nti ndinyom nile, ime ka di-ha buru ihe anēleda eleda n'anya-ha, mb͕e ha nāsi, Eze, bú Ahasuerọs, siri ka eme Vashti, bú nwunye eze, ka ọ bia n'iru ya, ma ọ biaghi.

18. Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.

Esta 1