Eklisiastis 4:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. Ọzọ, ọ buru na madu abua edinakọ, aru gēkpo kwa ha ọku: ma àru otù onye nke nání ya dina gēsi aṅa kpo ọku?

12. Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.

13. Ọ di nma, bú nwata nke bu ob͕eye ma ọ mara ihe, kari eze nke bu okenye ma ọ bu onye-nzuzu, onye nāmaghi inara nmata-ihe ọzọ.

14. N'ihi na n'ulo-nkpọrọ ka o siri puta ibu eze; n'ihi na ọbuná n'ala-eze-ya ka amuru ya ob͕eye.

Eklisiastis 4