Eklisiastis 3:9-13 Bible Nso (IGBOB)

9. Òle ihe fọduru onye nālu ọlu n'ihe nke ya onwe-ya nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya?

10. Ahuwom nweda-n'ala nke Chineke nyeworo umu madu iweda ha n'ala nime ya.

11. Ihe nile ọ bula ka O meworo ka ọ ma nma na mb͕e-ya: ọzọ, mb͕e ebighi-ebi ka O tiyeworo n'obi-ha, ma ka O si tiye ya madu agaghi-achọputa ọlu ahu nke Chineke luworo site na nmalite we rue na nsọtu.

12. Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya.

13. Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.

Eklisiastis 3