12. Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya.
13. Ọzọ kwa, madu ọ bula nke nēri ihe, nke nāṅu kwa ibe-ọṅuṅu, nke nāhu kwa ezi ihe na ndọb͕u nile ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu, onyinye Chineke ka nke ahu bu.
14. Amawom na ihe ọ bula Chineke nēme, nke ahu gādiru mb͕e ebighi-ebi: ọ dighi ihe agātukwasi ya, ọ dighi kwa ihe agēbìlata nime ya: Chineke emewo kwa ya, ka madu we tua egwu n'iru Ya.
15. Ihe ọ bula nke diworo, na mb͕e di anya gara aga ka ọ di; ọzọ, ihe ọ bula nke gādi adi, na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo: Chineke nāchọ kwa ihe achupuru achupu.
16. Ọzọ kwa, m'huru n'okpuru anyanwu ebe ikpé, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di; m'hu-kwa-ra ebe ezi omume, na ọ bu n'ebe ahu ka nmebi-iwu di.
17. Mu onwem siri n'obim, Onye ezi omume na onye nēmebi iwu ka Chineke gēkpe: n'ihi na mb͕e diri ihe ọ bula anēme na n'ihi ọlu ọ bula n'ebe ahu.
18. Mu onwem siri n'obim, Ọ bu n'ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n'onwe-ha.
19. N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu.
20. Ha nile nāla n'otù ebe; ha nile siri n'ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n'ájá.
21. Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n'okpuru rue ala?
22. M'we hu na ọ dighi ihe di ṅma kari ka madu nāṅuri n'ọlu-ya; n'ihi na nke ahu bu òkè-ya: n'ihi na ònye gēme ka ọ biaghachi ilekwasi ihe gādi mb͕e ọ gasiri?