Deuteronomi 5:22-25 Bible Nso (IGBOB)

22. Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.

23. O rue, mb͕e unu nuru olu ahu site n'etiti ọchichiri ahu na ugwu ahu nēre ọku, na unu biarurum nso, bú ndi-isi nile nke ebo nile unu, na ndi-okenye-unu;

24. unu we si, Le, Jehova, bú Chineke-ayi, emewo ka ayi hu ebube-Ya na idi-uku-Ya, ọ bu kwa olu-Ya ka ayi nuru site n'etiti ọku ahu; ta ka ayi huworo na Chineke nākpayere madu uka, ọ di kwa ndu.

25. Ma ub͕u a, n'ìhi gini ka ayi gānwu? n'ihi na ọku uku a gēripia ayi: ọ buru na ayi onwe-ayi anu kwa olu Jehova, bú Chineke-ayi, ọzọ, ayi gānwu kwa.

Deuteronomi 5