Deuteronomi 20:12-15 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n'udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n'agha:

13. Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n'aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula:

14. nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

15. Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.

Deuteronomi 20