8. Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.
9. N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu.)
10. Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi.