Deuteronomi 10:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ nēme ihe ekpere n'ikpe bayere nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru, Ọ nāhu kwa ọbìa n'anya, inye ya nri na uwe-nb͕okwasi.

19. Hu-kwa-nu ọbìa n'anya: n'ihi na ọ bu ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.

20. Jehova, bú Chineke-gi, ka i gātu egwu; Ya ka i gēfè, Ya ka i gārapara n'aru, aha-Ya ka i gēji ṅu iyi.

21. Ya Onwe-ya bu otuto-gi, Ya Onwe-ya bu kwa Chineke-gi, Onye meworo gi ihe uku ndia di egwu, nke anya-gi huworo.

22. Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.

Deuteronomi 10