Deuteronomi 1:31-34 Bible Nso (IGBOB)

31. na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.

32. Ma n'okwu nka unu ekweghi na Jehova, bú Chineke-unu,

33. Onye nēje n'iru unu n'uzọ ahu, ileputara unu ebe ima ulo-ikwū-unu, n'ọku n'abali, ime ka unu hu uzọ nke unu gēje nime ya, na n'igwé-oji ahu n'ehihie.

34. Jehova we nu olu okwu nile unu, O we we iwe, ṅua iyi, si,

Deuteronomi 1