23. Okwu ahu we di nma n'anyam: m'we si n'etiti unu chiri ndikom iri na abua, otù nwoke diri otù ebo:
24. ha we che iru, rigo n'ugwu ahu, biarue ndagwurugwu Eshkol, we ledo ya.
25. Ha we were ufọdu nime nkpuru ala ahu n'aka-ha, wedatara ayi ya, weghachiri ayi okwu, si, Ọ di nma, bú ala nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.
26. Ma unu achọghi irigo, kama unu nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu:
27. unu we tamu ntamu n'ulo-ikwū-unu, si, N'asì nke Jehova kpọrọ ayi ka O mere ka ayi si n'ala Ijipt puta, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ikpochapu ayi.