Daniel 6:24-28 Bible Nso (IGBOB)

24. Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.

25. Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n'uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku.

26. Anēsite n'irum nye iwu, si, n'ebe nile ọ bula anāchi n'ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n'iru Chineke nke Daniel: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile:

27. Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n'elu-igwe na n'uwa; Onye dọputaworo Daniel n'aka ọdum.

28. Ihe ga-kwa-ra Daniel nka nke-ọma n'ọbubu-eze Daraiọs na n'ọbubu-eze Sairọs, bú onye Peasia.

Daniel 6