Daniel 5:15-18 Bible Nso (IGBOB)

15. Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n'irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m'mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a.

16. Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.

17. Daniel zara, si n'iru eze, Ka onyinye-gi diri gi onwe-gi, gi nye kwa onye ọzọ ugwọ-ọlu-gi; ma m'gāguru eze ihe a edere, me ka ọ mara isi-ya.

18. Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:

Daniel 5