16. ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n'isi.
17. N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.
18. Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n'ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m'mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n'ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi.