Daniel 2:40-49 Bible Nso (IGBOB)

40. Ma ala-eze nke-anọ gādi ike ka ígwè: n'ihi na ígwè nētipia tida kwa ihe nile: na dika ígwè nke nētijisi ihe ndia nile, otú a ka ọ gētipia, tijisia.

41. Ma ebe i huru ukwu-ya abua na nkpisi-ukwu-ya nile, na ufọdu nime ha bu urọ ọkpu-ite, ma ufọdu nime ha bu ígwè, ala-eze ekewara ekewa ka ọ gābu; ma nguzosi-ike ufọdu nke ígwè ahu aghaghi idi nime ya, n'ihi na i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti.

42. Ma nkpisi-ukwu nile nke ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè, ma ufọdu nime ha bu urọ, otú a ufọdu nime akuku ala-eze ahu gādi ike, ma ufọdu nime ya gābu ihe nādighi ike ntiwa.

43. Ma ebe i huru ígwè ahu na agwakọtara ya na urọ apiti, ha ganēji nkpuru ndi ọzọ gwakọta onwe-ha; ma ha agaghi-adi nārapara n'aru ibe-ha n'otù n'otù, ọbuná otú ígwè na urọ nādighi-agwakọta.

44. Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.

45. N'ihi na i huru na awaputara otù nkume n'ugwu ahu nke anējighi aka wa, na o tipiara ígwè ahu na ọla ahu na urọ ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu; Chineke di uku emewo ka eze mara ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: nrọ a nēguzosi kwa ike, ọ bu kwa ihe kwesiri ntukwasi-obi ka akukọ-isi-ya bu.

46. Mb͕e ahu ka eze, bú Nebukadneza, ji da kpue iru-ya n'ala, ọ bu kwa Daniel ka ọ kpọrọ isi ala nye, si ka awusiri ya onyinye-inata-iru-ọma na ihe ísì utọ di iche iche.

47. Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.

48. Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.

49. Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n'ọnu-uzọ-ama eze.

Daniel 2