Daniel 2:33-37 Bible Nso (IGBOB)

33. ogwe-ukwu-ya abua bu ígwè, ukwu-ya abua, ufọdu nime ha bu ígwè ma ufọdu nime ha bu urọ.

34. I nọ nāhu rue mb͕e awaputara otù nkume nke anējighi aka wa, o we tie onyinyo ahu n'ukwu-ya abua nke bu ígwè na urọ, tipia ha.

35. Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.

36. Nka bu nrọ ahu: isi-ya ka ayi gākọ kwa n'iru eze.

37. Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;

Daniel 2