Daniel 2:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.

4. Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.

5. Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia.

6. Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya.

7. Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa.

8. Eze zara, si, Mu onwem amasiwo na mb͕e a ka unu onwe-unu nāzuchapu, n'ihi na unu ahuwo na o nēguzosi ike site n'ọnum, bú okwu a:

9. na asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a, otù ka iwu enyere unu bu: n'ihi na okwu-ugha nke bibi-kwa-ra ebibi ka unu zubekọworo ikwu n'irum, rue mb͕e mb͕e a gērughari: n'ihi nka zerem nrọ a, m'we mara na unu gākọrọm isi-ya.

10. Ndi Kaldea zara n'iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n'elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n'ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n'aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a.

11. Ajuju a nke eze nāju di ike, ọ dighi kwa onye ọzọ nke gākọ ya n'iru eze, ma-ọbughi nání chi-ayi, ndi ebe-obibi-ha nādighi n'etiti anu-aru, bú madu.

12. N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi.

Daniel 2