19. Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n'ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe.
20. Daniel zara, si, Ka aha nke Chineke buru ihe agọziri agọzi site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na amam-ihe na idi-ike, nke Ya ka ha bu:
21. ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:
22. Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ.
23. Gi, Chineke nke nnam-hà, ka mu onwem nēkele, nāja kwa, n'ihi na amam-ihe na idi-ike ka I nyeworom, ub͕u a ka I mewo-kwa-ra ka m'mara ihe ayi riọrọ n'aka Gi: n'ihi na okwu eze ka I meworo ka ayi mara.
24. N'ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: me ka m'bata guzo n'iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m'gākọrọ eze.
25. Mb͕e ahu Ariok were ọsọ me ka Daniel bata n'iru eze, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya, Achọputawom otù nwoke nime umu ndi Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, onye gēme ka eze mara isi nrọ ahu.
26. Eze zara, si Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, Ọ̀ gābu na i puru ime ka m'mara nrọ a nke m'huworo, na isi-ya?
27. Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;
28. ma Chineke di, Onye nọ n'elu-igwe, Nke nēkpughe ihe-nzuzo nile, O mewo kwa ka eze, bú Nebukadneza, mara ihe aghaghi idi n'ikpe-azu ubọchi ndia. Nrọ-gi, na ọhù nile nke isi-gi n'elu ihe-ndina-gi, nka ka ọ bu:
29. gi onwe-gi, eze, èchìchè-gi nile rigotara n'uche-gi n'elu ihe-ndina-gi, ihe aghaghi idi mb͕e nka gasiri: Onye ahu nke nēkpughe ihe-nzuzo nile emewo kwa ka i mara ihe aghaghi idi.