2. Ọzọ, ọtutu madu nime ndi nāraru ura n'ala, bú ájá, gēteta, ufọdu ibà na ndu ebighi-ebi, ufọdu ibà n'ita-uta riri nne na oyi agāsọ ha nke-uku mb͕e ebighi-ebi.
3. Ma ndi ahu ndi nwere uche ganēnwu ọcha dika onwunwu-ọcha nke mbara-ígwé; ndi nēme ọra madu ka ha ghọ ndi ezi omume ganāmu kwa dika kpakpando rue mb͕e nile ebighi-ebi.
4. Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.
5. M'we hu, mu onwem, bú Daniel, ma, le, abua ọzọ nēguzo, otù onye n'otù usọ osimiri ahu, ibe-ya n'usọ osimiri nke-ọzọ.
6. Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi?