11. Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya.
12. Agāchipu kwa ìgwè madu ahu, obi-ya ewe di elu: ọ gēme kwa ka nnù kwuru nnù madu da ada, ma ọ gaghi-adi ike.
13. Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.
14. Ma na mb͕e ahu ka ọtutu madu gēguzo ọtọ imegide eze Ndida: ọzọ, umu nke ndi nēme ihe-ike n'etiti ndi-gi gēbuli onwe-ha ime ka ọhù ahu guzo; ma ha gāsu ngọngọ.