Aisaia 7:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. ọzọ, isi Efraim bu Sameria, isi Sameria bu kwa nwa Remalaia. Ọ buru na unu adighi-ekwe, n'ezie unu agaghi-ekwesi ntukwasi-obi.

10. Jehova we gwa kwa Ehaz okwu ọzọ, si,

11. Riọrọ onwe-gi ihe-iriba-ama n'aka Jehova, bú Chineke-gi; riọ ya n'ebe miri emi, ma-ọbu n'ebe di elu nke di n'elu.

12. Ehaz we si, M'gaghi-ariọ, m'gaghi-anwa kwa Jehova.

13. O we si, Biko, nurunu, ulo Devid; ọ̀ bu ihe ntà na unu nēme ka ike gwu madu, na unu gēme kwa ka ike gwu Chinekem?

14. N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.

15. Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe.

16. N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi.

Aisaia 7