Aisaia 65:8-12 Bible Nso (IGBOB)

8. Otú a ka Jehova siri, Dika anāchọta manya-vine ọhu n'uyọkọ nkpuru-vine, ewe si, Ebibila ya, n'ihi na ngọzi di nime ya: otú a ka M'gēme N'ihi ndi-orùm, ka M'we ghara ibibi ha nile.

9. M'gēme kwa otù nkpuru ka o si na Jekob puta, na otù onye-nnweta nke ugwum nile ka o si na Juda puta: ndi M'rọputaworo ewe nweta ya, ndi-orùm gēbi kwa n'ebe ahu.

10. Sheron gāghọ kwa ebe-ita-nri nke ìgwè ewu na aturu, ndagwurugwu Ekoa gāghọ kwa ebe ìgwè ehi nāmakpu amakpu. diri ndim chọworom.

11. Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;

12. M'gāgukọta unu nye mma-agha, unu nile gēruru kwa ala ka ewe b͕ue unu; n'ihi na akpọrọm unu òkù, ma unu azaghm; ekwurum okwu, ma unu anughi; unu we me ihe jọrọ njọ n'anyam abua, ọ bu kwa ihe nke nātọghm utọ ka unu rọputara.

Aisaia 65