Aisaia 57:18-21 Bible Nso (IGBOB)

18. Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú.

19. Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike.

20. Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti.

21. Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.

Aisaia 57