Aisaia 5:9-12 Bible Nso (IGBOB)

9. Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.

10. N'ihi na ala ubi-vine nke madu gēji ehi abua alu n'ubọchi iri gēweputa nání otù ihe-ọtùtù bath nke manya-vine, ọzọ, otù ihe-ọtùtù homer nke nkpuru-ọghigha gāmi nání otù ihe-ọtùtù ephah.

11. Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.

12. Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.

Aisaia 5